Abụ nke Abụ 5

Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.

Song of Solomon 5:16 (UKJV) His mouth is most sweet: yea, he is altogether lovely. This is my beloved, and this is my friend, O daughters of Jerusalem.

14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.

15Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.

16Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.