Abụ nke Abụ 7

Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.

Song of Solomon 7:1 (UKJV) How beautiful are your feet with shoes, O prince's daughter! the joints of your thighs are like jewels, the work of the hands of a cunning workman.

1Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.

2Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.

3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.