Abụ nke Abụ 7

Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.

Song of Solomon 7:2 (UKJV) Your navel is like a round goblet, which wants not liquor: your belly is like an heap of wheat set about with lilies.

1Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.

2Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.

3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge.

4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.