Abụ nke Abụ 7

Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.

Song of Solomon 7:4 (UKJV) Your neck is as a tower of ivory; yours eyes like the pool in Heshbon, by the gate of Bathrabbim: your nose is as the tower of Lebanon which looks toward Damascus.

2Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.

3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge.

4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.

5Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo. Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.

6Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.