Zekaraya 9

Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.

Zechariah 9:12 (UKJV) Turn you to the strong hold, all of you prisoners of hope: even to day do I declare that I will render double unto you;

10Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.

11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.

12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.

13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.