11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.
12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.
13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.
15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.