Zekaraya 9

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

Zechariah 9:14 (UKJV) And the LORD shall be seen over them, and his arrow shall go forth as the lightning: and the LORD God shall blow the trumpet, and shall go with whirlwinds of the south.

12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.

13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.

16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.