Zekaraya 9

Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.

Zechariah 9:16 (UKJV) And the LORD their God shall save them in that day as the flock of his people: for they shall be as the stones of a crown, lifted up as an explicit sign upon his land.

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.

16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.

17Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu! Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma, mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.