12“Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
15Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.