Zefanaya 2

“Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”

Zephaniah 2:12 (UKJV) All of you Ethiopians also, all of you shall be slain by my sword.

10Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.

12“Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”

13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.

14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.