33Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya.
34Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo.
35Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru.
36Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.
37Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ.