1Nʼoge a, Neeman bụ ọchịagha ndị agha eze Aram, Ọ bụ onye dị ukwuu nʼanya nna ya ukwu, bụrụkwa onye a na-enye nsọpụrụ nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼaka ya nye ndị agha Aram mmeri nʼọgbọ agha dị iche iche. Ọ bụ dike na dimkpa nʼagha, maọbụ onye ekpenta.
2Otu mgbe, ụfọdụ nʼime ndị agha Aram na-apụnara ndị mmadụ ihe pụrụ ga dọta otu nwaagbọghọ nta site nʼIzrel, onye na-ejere nwunye Neeman ozi.
3Ọ sịrị nne ya ukwu, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na nna m ukwu ga-aga hụ onye amụma nọ na Sameria. Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta a.”
4Neeman nụrụ nke a, bilie gaa kọọrọ eze Aram ihe niile nwaagbọghọ a si Izrel kwuru.