2Otu mgbe, ụfọdụ nʼime ndị agha Aram na-apụnara ndị mmadụ ihe pụrụ ga dọta otu nwaagbọghọ nta site nʼIzrel, onye na-ejere nwunye Neeman ozi.
3Ọ sịrị nne ya ukwu, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na nna m ukwu ga-aga hụ onye amụma nọ na Sameria. Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta a.”
4Neeman nụrụ nke a, bilie gaa kọọrọ eze Aram ihe niile nwaagbọghọ a si Izrel kwuru.
5Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ.
6Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.”