Diuteronomi 3

Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon.

Deuteronomy 3:8 (UKJV) And we took at that time out of the hand of the two kings of the Amorites the land that was on this side Jordan, from the river of Arnon unto mount Hermon;

6Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị.

7Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị.

8Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon.

9(Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.)

10Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.