Aịzaya 15

Amụma megide Moab: Ar dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. Kia dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.

Isaiah 15:1 (UKJV) The burden of Moab. Because in the night Ar of Moab is laid waste, and brought to silence; because in the night Kir of Moab is laid waste, and brought to silence;

1Amụma megide Moab: Ar dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. Kia dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.

2Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.

3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.