11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
13Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.
14Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị, tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa. Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike. E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.