9Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.
10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị. I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị. Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ, maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,
11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
13Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.