Aịzaya 17

Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị. I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị. Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ, maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,

Isaiah 17:10 (UKJV) Because you have forgotten the God of your salvation, and have not been mindful of the rock of your strength, therefore shall you plant pleasant plants, and shall set it with strange slips:

8Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka. Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee. Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera, maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.

9Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.

10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị. I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị. Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ, maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,

11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.

12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.