1Nke a bụ amụma megide Damaskọs, isi obodo Siria. “Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ, kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda.
2Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea, ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ.
3Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa, ya na ike alaeze nke sị Damaskọs, ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka ebube nke ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
4“Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala. Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.
5Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ, na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka nʼime Ndagwurugwu Refaim.