5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo, ha bara ụba nke ukwuu. Ala ha jupụtara nʼịnyịnya. Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
8Ala ha jupụtara nʼarụsị, ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ, ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala, meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala. Ya mere, agbagharala ha.