Aịzaya 22

Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.

Isaiah 22:11 (UKJV) All of you made also a ditch between the two walls for the water of the old pool: but all of you have not looked unto the maker thereof, neither had respect unto him that fashioned it long ago.

9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.

10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.

11Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.

12Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọrọ unu ụbọchị ahụ ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ, kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe.

13Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.