Aịzaya 22

Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.

Isaiah 22:9 (UKJV) All of you have seen also the breaches of the city of David, that they are many: and all of you gathered together the waters of the lower pool.

7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.

8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.

9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.

10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.

11Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.