5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
6Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.
7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.