6Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.
7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.
10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.