Aịzaya 22

Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru: “Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna, nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze:

Isaiah 22:15 (UKJV) Thus says the Lord GOD of hosts, Go, get you unto this treasurer, even unto Shebna, which is over the house, and say,

13Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”

14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

15Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru: “Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna, nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze:

16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?

17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.