6Ọ na-enyefe obodo ahụ nʼaka ndị a na-emegbu emegbu, na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.
7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu, gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.
8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.
10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.