Aịzaya 26

Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.

Isaiah 26:9 (UKJV) With my soul have I desired you in the night; yea, with my spirit within me will I seek you early: for when your judgments are in the earth, the inhabitants of the world will learn righteousness.

7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu, gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.

8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.

9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.

10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.

11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu, ha adịghị ahụ ya. Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha. E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.