Aịzaya 28

Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem, obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi. Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma. Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi.

Isaiah 28:1 (UKJV) Woe to the crown of pride, to the drunkards of Ephraim, whose glorious beauty is a fading flower, which are on the head of the fat valleys of them that are overcome with wine!

1Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem, obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi. Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma. Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi.

2Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume, dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi, dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo, ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala.

3Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke, ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.