1Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
2Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
3Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.