Aịzaya 51

Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.

Isaiah 51:2 (UKJV) Look unto Abraham your father, and unto Sarah that bare you: for I called him alone, and blessed him, and increased him.

1Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!

2Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.

3Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.

4Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.