12Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.
13Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’
14“Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’
15Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.
16“Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha.