1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia,
2sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.”
3Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,
4‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.