Jeremaya 21

‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.

Jeremiah 21:4 (UKJV) Thus says the LORD God of Israel; Behold, I will turn back the weapons of war that are in your hands, wherewith all of you fight against the king of Babylon, and against the Chaldeans, which besiege you without the walls, and I will assemble them into the midst of this city.

2sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.”

3Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,

4‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.

5Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu.

6Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.