39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”
40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
41A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
43Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.