40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
41A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
43Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
44“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu ga-adaba nʼolulu. Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta ka igbudu ga-ejide. Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.