8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
10Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
11“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?