9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
10Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
11“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
13“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.