2“Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
3Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri.
4Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
5“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’