4Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
5“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
7Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.