24Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
25Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.
26Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị. Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.
27“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
28Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.