10Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile.
11Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ.
12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
13Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ.
14Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.