Joshua 11

Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.

Joshua 11:14 (UKJV) And all the spoil of these cities, and the cattle, the children of Israel took for a prey unto themselves; but every man they stroke with the edge of the sword, until they had destroyed them, neither left they any to breathe.

12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

13Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ.

14Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.

15Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

16Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.