11Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ.
12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
13Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ.
14Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.
15Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.