9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
10Ndị ji ọbara wuo Zayọn, werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
12Ọ bụ nʼihi gị ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi, Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.