7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme, ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ. Ha ga-ekpuchi ihu ha, nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike, ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị, jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi, na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya, na nye Izrel mmehie ya.
9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
10Ndị ji ọbara wuo Zayọn, werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”