16na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;
17Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka.
18Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284).
19Ndị nche ọnụ ụzọ ama, Akub, Talmon na ndị otu ha dị otu narị na iri asaa na abụọ (172) nʼọnụọgụgụ, ha bụ ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama niile.
20Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya.