16Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
17Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị: Geshọn, Kohat na Merari.
18Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị: Libni na Shimei.
19Ụmụ Kohat dịka ikwu ha si dị: Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
20Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị: Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị.