3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,
5onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
6Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
7O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: