34Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.
35Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ;
36ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri, ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi.
37Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
38ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba, o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.