118Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.
119Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.
120Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.
121Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.
122Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.